Deuteronomy 33

Mosis agọzie ụmụ Izrel

1Nke a bụ ngọzị Mosis, onye nke Chineke, jiri gọzie ụmụ Izrel, tupu ọ nwụọ. 2Ọ sịrị,

Onyenwe anyị si nʼugwu Saịnaị bịa,
ọ waliteere ha site nʼugwu Sia,
o nwupụtara site nʼugwu Paran
Ya na igwe ndị nsọ so bịa
site nʼakụkụ ndịda, site nʼala ala ugwu ahụ.
3Nʼezie, ọ bụ gị na-ahụ ndị mmadụ ahụ nʼanya,
ndị nsọ ahụ niile dị gị nʼaka.
Nʼụkwụ gị ka ha na-ada kpọọ isiala,
gị na-akụziri ha ihe,
4iwu ahụ Mosis nyere anyị,
ihe onwunwe nke ọgbakọ Jekọb.
5Ọ bụ ya bụ eze na Jeshurun,
mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ
ha na ebo niile nke Izrel.

6“Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ,
ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.”
7Ihe a ka o kwuru banyere Juda,

“Nụrụ, Onyenwe anyị, akwa Juda,
kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ.
Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche.
Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.”
8Banyere Livayị o kwuru sị,

“Urim na Tumim gị dịịrị
ohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi.
Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa,
gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba.
9Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị,
‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’
Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara,
ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya.
Ma o debere okwu gị,
cheziekwa ọgbụgba ndụ gị.
10Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị,
na-akụzikwara Izrel iwu gị.
Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị,
na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị.
11Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị,
ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ.
Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya,
tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.”
12Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị,

“Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya.
Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile.
Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.”
13Banyere Josef o kwuru sị,

“Ka Onyenwe anyị gọzie ala ya,
ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu,
na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala,
14na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta,
na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta,
15na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie,
na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ,
16na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile,
na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ.
Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef,
nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya.
17Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ,
mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa.
Ya ka ọ ga-eji sọda mba niile
ọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa.
Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dị
otu a ka imerime puku ndị Manase dị.”
18Banyere Zebụlọn, o kwuru sị,

“Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị,
ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị.
19Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu,
nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume,
ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri,
site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.”
20Banyere Gad, o kwuru sị,

“Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara.
Gad na-ebi dịka ọdụm,
na-adọkapụ aka maọbụ isi.
21Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya;
oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya.
Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ,
o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi,
na ikpe ya niile banyere Izrel.”
22Banyere Dan, o kwuru sị,

“Dan bụ nwa ọdụm,
onye na-esi na Bashan mapụta.”
23Banyere Naftalị, o kwuru sị,

“Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma Onyenwe anyị dịrị,
o jupụtakwara na ngọzị ya,
ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.”
24Banyere Asha, o kwuru sị,

“Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ,
ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ,
ka o jirikwa mmanụ
Mmanụ bụ ihe ngosi na mmadụ bụ ọgaranya nʼọrụ ubi, nke kachasị, ọ bụrụ na onye dị otu a na-akọ mkpụrụ oliv nke e si na ya emepụta mmanụ. Jen 49:20; Job 29:6.
saa ụkwụ ya.
25Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe,
dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị.

26“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun,
onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka,
onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya.
27Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị.
Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị.
Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị,
‘Bibie ha!’
28Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo,
isi iyi mmiri Jekọb dị chịm,
nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ
ebe igirigi nke eluigwe na-ada.
29Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel,
onye dị ka gị
ndị Onyenwe anyị zọpụtara?
Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị,
na mma agha gị dị ebube.
Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị,
ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”
Copyright information for IboBIU